in ,

Patty Obasi – Ihunanya

Ezinwanyi di uko

Ezinwanyi di uko by Patty Obasi album cover
Ezinwanyi Di Uko album cover

Soundwela presents Ihunanya by Patty Obasi for free mp3 download. Ihunanya is a track in Patty Obasi’s album titled “Ezinwanyi di uko“. Other songs in this album are Onye Kwere Ekwe Anwughi Anwu, Eluigwe Bia Nyere Anyi Aka, Akuko Mgbe Ebighi Ebi, Achorom Ikpere Gi and Alaeze Gi.

Ihunanya Lyrics:

Na oge mbu odi ihe eji mara ndi kwere ekwe, ndi mbu na eji maranathan anata ibe n’aka.

Ndi mbu na eji oke Ihunanya ebute ibu diri ibe ha, mgbe alaeze bu olile anya, mgbe okwukwe nwere ihunanya.

Mgbe okwukwe nwere ihunanya.

Ma ihunanya gbara oso na ulo uka ka m gwa gi Ihe churu ya oso, ila otu na akpomasi mara mara n’iru churu ya oso, nwanna muna ya na achu muo si na mu yiri muo, nwanna muna ya chuga muo si na mu yiri muo.

Owe buru okwa ka ana azo, maka onwere okwa obu ya nwezi ego.

Winner takes it all, na ulo uka ka okazi njo, when a winner grabs it all, it makes the loser looks so small. When the winner takes it all, it makes the loser stand so small.

Na ulo uka ka obaziri uba, na ulo uka ka okazi njo. Ma ahia di na uwa di na uka, amaghi onye zukariri ibe ya.

Ilo di na uwa yiri agwo abali ezi anyi amaghi ebe odewere isi.

Bia gbawara mu egwu Ihunanya, agam agukwara gi egwu olileanya.

Ajero kacha ihe gburu nzoko ajero joro njo, ilo di na uwa yiri agwo abali ezi, onye ga agwa m ebe odewere isi. Ajero joro njo, okpukpe ajero siri ike.

Bia gbawara mu egwu ihunanya, bia gbawara mu egwu ihunanya. Bia gbawara mu egwu olileanya, bia gbawara mu egwu olileanya.

Ghara ndi na eji ndoro ndoro egbu nzuko ndi nke fa ziri olu. Ndi na ekwu maka obi onye ozo ma obi nke ha ka n’anya. Ghara ndi nke fa kporo olu, ghara nkita ogbo maka okpukpu.

Bia gbawara m egwu ihunanya, aga m akukwara gi egwu olileanya.

Ajero boro innocent ebubo, si ya ekwuna okwu, Ajero lechara onye Chineke kporo ozi kpogbuo ya na aguu. Ajero lechara onye Chineke kporo ozi nyegbuo ya na nsi, ajero lechara onye Chineke tere mmanu gbaa ya mbo n’isi.

Ihe Chineke ga ekpe riri nne. Ihe Jehovah ga ekpe erika.

Igbo biara uka lee, ihugo ihe churu ihunanya, ndi mu na ha biara okpukpe ihula ihe churu ihunanya. Ila otu na akpomasi mara mara n’ihu churu ya oso. Ila otu na akpomasi mara mara n’ihu gbam n’azu.

Bia gbawara m egwu ihunanya, ihunanya agape love. Agape love achoghi ima ebe isi bia ojughi onye muru gi, Agape love achoghi ima ebe isi bia, obughi ihe ojuru gi.

Ihe ochoro ima bu otu isi eme, ihe masiri ya bu onye ina efe. Omasiri ya bu onyinye amara Chineke nyere gi obu ya masiri ya.

Bia gbawara m egwu ihunanya, bia gbawara m egwu ihunanya.

Kamgbe m biara uwa, akaghi hu ihe ka ihunanya. Kamgbe m biara uwa akaghi m ri ihe ka olileanya.

Ma onye riri ihe ka olileanya ya biko riko ma okwu esela, onye riri ihe ahu ka olileanya ya biko riko ma okwu esela doo.

Bia gbawara m egwu ihunanya, Agam akukwara gi egwu olileanya.

Ihunanya by Patty Obasi mp3 download.

Download “IHUNANYA by Patty Obasi” IHUNANYA-Soundwela.com_.mp3 – Downloaded 3864 times – 4.89 MB


 

Ezinwanyi di uko by Patty Obasi album cover

Patty Obasi – Onye Kwere Ekwe

Gozie Okeke - Old School Gospel Rhythm (full album) | Gozie Okeke Old School Gospel Rhythm Soundwela

Gozie Okeke – Old School Gospel Rhythm (full album)